- Global Voices n'asusu Igbo - https://ig.globalvoices.org -

Global Voices is seeking a Finance & Administrative manager

Categories: Mgbasaozi ndị Amaala, Ọkwa dị icheiche

Screen grab from a video taken on January 25, 2015 at the Global Voices 2015 Summit in Cebu, Philippines. Video by Global Voices and PR Works.

Global Voices na-achọ maka iwe n'ọrụ Onye na-ahụ maka ego nakwa nlekọta ụlọ ọrụ. 

Anyị bụ ọ gazuru ụwa niile site n'ikuku, nzukọ a abụghị maka ịchụ nta ego(gụọ maka ebumnobi anyị ebe a) nke enweghịkwa ụlọ ebe akpọrọ isi ụlọ ọrụ, ya bụ obodo ọ bụla ịnọ egbochighi gị inwete ọrụ a.

Ọchọọ ọ bụla ga-eji aka ya hazie etu ọrụ ya ga-esi na-aga, gburugburu ọrụ ya bụkwa nke a na-arụ n'ikuku.

Onye nlekọta ego na ụlọ ọrụ ga-ahụ maka ihe niile gbasara etu esi e ji ego arụ ọrụ, etu ụlọ ọrụ si aga nakwa etu mmadụ dị icheiche si arụ ọrụ ha.

Ọrụ ya gụnyere : Ntọsasi n'ụzọ dabara adaba na nleru anya na ihe niile gbasara ego na arụmọrụ, ụzọ iwu ndị anabatara, ị nata na inye ọrụ nakwa akwụkwọ usoro ya, gụnyere usoro ndị dịgasị mkpa, ma so nyekwara ịkpa nkata nakwa ikwado ị hụ na otu a na-aga nkeọma.

Onye nlekọta ego na ụlọ ọrụ ga na-elekọta kwa Stichting Global Voices (SGV), otu Dutch na-abụghị maka ịchụ nta ego nakwa Friends of Global Voices (FGV), a US 501(c)3.

Ọrụ a gụnyere ihe ndị a:

Nlekọta Etu Ego si Arụ Ọrụ

Ego ndị a na-anabata

Ego ndị a ga-akwụ 

Nlekọta Ego Nnwete na Ego e wepụtara maka Ọrụ

Nlekọta Ọrụ 

Itinye N'ọru 

Ọrụ ndị ọzọ dịka esi nye ya.

Iji gosi mmasị 

Wete akwụkwọ nkọwa onwe nakwa leta mkpuchi e dere n'asụsụ Bekee, nke ga-egosi ọrụ gị ma kọwaa ihe iji chee na e kwesịrị ka e wee gị n'ọrụ ndị Global Voices gaa bs@globalvoices.org. Biko gbalịa fenye aha gị nakwa “Finance & Admin Manager” n'ebe ndeba isiokwu. Oge nkwụsị igosi mmasị n'ọrụ bụ 11:59pm EST (GMT -4) on September 19, 2019. 

Anyị ga-aka nabata ndị na-esighị na mba North America na Western Europe, anyị na-agbakwa ndị so na-akwado ọrụ Global Voices ume ka ha sonye n'igosi mmasị n'ọrụ a.