Global Voices is seeking a Finance & Administrative manager

Screen grab from a video taken on January 25, 2015 at the Global Voices 2015 Summit in Cebu, Philippines. Video by Global Voices and PR Works.

Global Voices na-achọ maka iwe n'ọrụ Onye na-ahụ maka ego nakwa nlekọta ụlọ ọrụ. 

Anyị bụ ọ gazuru ụwa niile site n'ikuku, nzukọ a abụghị maka ịchụ nta ego(gụọ maka ebumnobi anyị ebe a) nke enweghịkwa ụlọ ebe akpọrọ isi ụlọ ọrụ, ya bụ obodo ọ bụla ịnọ egbochighi gị inwete ọrụ a.

Ọchọọ ọ bụla ga-eji aka ya hazie etu ọrụ ya ga-esi na-aga, gburugburu ọrụ ya bụkwa nke a na-arụ n'ikuku.

Onye nlekọta ego na ụlọ ọrụ ga-ahụ maka ihe niile gbasara etu esi e ji ego arụ ọrụ, etu ụlọ ọrụ si aga nakwa etu mmadụ dị icheiche si arụ ọrụ ha.

Ọrụ ya gụnyere : Ntọsasi n'ụzọ dabara adaba na nleru anya na ihe niile gbasara ego na arụmọrụ, ụzọ iwu ndị anabatara, ị nata na inye ọrụ nakwa akwụkwọ usoro ya, gụnyere usoro ndị dịgasị mkpa, ma so nyekwara ịkpa nkata nakwa ikwado ị hụ na otu a na-aga nkeọma.

Onye nlekọta ego na ụlọ ọrụ ga na-elekọta kwa Stichting Global Voices (SGV), otu Dutch na-abụghị maka ịchụ nta ego nakwa Friends of Global Voices (FGV), a US 501(c)3.

Ọrụ a gụnyere ihe ndị a:

Nlekọta Etu Ego si Arụ Ọrụ

  • Ilekọta Ụlọ ego iji hụ na e debara ihe niile ka ọ kwesịrị nakwa n'oge ọ kwesịrị.
  • Nlebaghari anya iji hụ na a gbasoro usoro e wepụtara n'ihe gbasara ụzọ e si eji ego eme ihe.
  • Ilekọta ihe niile gbasara ego nakwa etu esi eji ya eme ihe, usoro niile, ngwa ọrụ niile, nakwa isi ihe niile sekpu ntị.
  • Ilekọta nkwado niile gbasara mmechi ọnwa nakwa ndepụta etu e siri jiri ego rụọ ọrụ nye SGV, nakwa ndepụta etu e si jiri ego rụọ ọrụ na ngwụcha ọnwa anọ o bụla nye FGV.
  • Ịgbazi anya hụ na ihe niile na-eme n'oge ọ kwesịrị ma hụkwa na ozi a ga-ezigara ndị nkwado, ndị nlekọta nakwa ndị isi ụlọ ọrụ gbasara etu e si jiri ego mee ihe dị ka ọ siri mee.
  • Ịhụ na e nwere ntụrụanya ego ndị e chere a ga-eji mee ihe n'ọnwa anọ o bụla nye ndị nlekọta nakwa ndị isi ụlọ ọrụ.
  • Nlekọta nkwado niile a ga-eme gbasara emume kwa afọ nke FGV 990.
  • Nlekọta nlebanya n'etu esi were ego mee ihe kwa afọ nke SGV.
  • I wepụta ihe niile metụtara ụlọ ọrụ nakwa nlezianya nke agamunjem ego nke ụlọ ọrụ, akwụkwọ ngosi ole klaasị dị, na akwụkwọ ngosi ndị ahịa anyị.
  • Ilekọta mmekọrịta nke ọba ego na ụlọ ọrụ.
  • Igbado anya hụ na a na-agbaso iwu e wepụtara maka idekwa ego (Generally Accepted Accounting Principles (GAAP)) nakwa ihe ndị atụrụ anya n'aka n'ụlọ ọrụ US 501(c)3.

Ego ndị a na-anabata

  • Idebanye ihe niile a natara iji hụ na e debara ya n'ụzọ atụrụ anya n'ime sọfụtwịa ndeba.
  • Ikwado na izigara ndị ahịa anyị akwụkwọ ngosi ụgwọ a kwụrụ.
  • Ịhụ na a natara ihe niile e kwesịrị ịnata n'oge ọ kwesịrị; idekwaba nakwa ilebaghari anya na ozi A/R na-emezi ochie.

Ego ndị a ga-akwụ 

  • Ndebanye n'akwụkwọ ngosi ịkwụ ụgwọ, akwụkwọ ozi ego e mefuru, nakwa ego ndị ọzọ a kwụrụ iji hụ na e debara ka ọ sịrị dị n'ime sofutwia nde a.
  • Nnabata na ilebanye anya na nzukọrita ozi si n'aka ndị mgbere.
  • Igbado anya hụ na akwụkwọ nkwado niile bụ nke e ledoro anya ma dịkwa ka ọ kwesịrị.
  • Nkwado na izifega ego n'ikuku ma ọ bụ site n'ụzọ dị icheiche ndị ụlọ ọrụ si akwụ ụgwọ.
  • Mmezi ndeba nke ego dị icheiche site na ịchọpụta iri mperi ọ bụla e nwere n'iziga ozi ma ọ bụ nke etinyeghi na mbụ.
  • Ịnabata, ịchọpụta nakwa ịza ajụjụ ọ bụla gbasara ogo ndeba ego, tinyere nzikokorita ozi gbasara ọsisa nye ndịiche  gbara elu nye ndị e kwesịrị inye ya.

Nlekọta Ego Nnwete na Ego e wepụtara maka Ọrụ

  • Mmebe akwụkwọ ngosi ego ọrụ kwa afọ maka SGV.
  • Ha na ndị nlekọta ngalaba niile ga na-alụkọta iji ihibe ma na-elekọta kwa ego ọrụ nke ngalaba ọ bụla.
  • Ha, ndị ọrụ na ndị nlekọta ọrụ ga na-arụkọ ọrụ iji depụtar ndepụta mbụ maka ntụta aro ego a ga-akwado maka ịrụ ọrụ.
  • Ilekọta ego nnwete na ego e wepụtara maka ọrụ, tinyere ego ọrụ maka ọnwa ọ bụla rue mgbe e mechara ihe gbasara ego nnwete ahụ.
  • Ịgba mbọ hụ na a gbasoro ọnọdụ niile ndị nkwado wepụtara, nakwa idebanye nke ọma akwụkwọ nkwado niile.
  • Ilekọta nzigara ndị nkwado ozi gbasara etu e si eji ego arụ ọrụ, ịhụ na ewe ara ozi n'oge nakwa n'ụdị ọ kwesịrị ịdị.
  • Ịhụ na kalinda nzikirita ozi nke ndị ego nnwete dị.
  • Ilekọta ọrụ na etu esi jiri ego arụ ọrụ ọ bụla e nwetere n'etiti ha na ụlọ ọrụ na-akwado ha.

Nlekọta Ọrụ 

  • Ime ndepụta mbụ maka inwete ọrụ nke ndị GV na-enye ma ọ bụ na-enwete ọrụ, ma mee ka ọ nwee akara ndị otu GV.
  • Ime ndepụta mbụ maka inwete ọrụ nye SGV na FGV na ụlọ ọrụ na-akwado ha ma mee ka ọ nwee akara ndị GV.
  • Ihu na ihe nleleanya maka inweta ọrụ na mgbakwunyere so ya bụ nke a na-eleghari anya ma na-edozikwa afọ.

Itinye N'ọru 

  • Ijigide na idozi Faịlụ niile metụtara iwu na-achị ihe a na-eme.
  • Ilekọta ihe niile gbasara nchedo ndụ na ihe nnwete nakwa irekwa ya kwa afọ.
  • Ịmepụta na idozi ozi na metụtara ego ntuputa maka ọrụ, nakwa akwụkwọ ndeba na nleleanya ya.
  • Ịdepụta ndepụta mbụ kwa ọnwa anọ o bụla nye ndị isi ụlọ ọrụ.

Ọrụ ndị ọzọ dịka esi nye ya.

Iji gosi mmasị 

Wete akwụkwọ nkọwa onwe nakwa leta mkpuchi e dere n'asụsụ Bekee, nke ga-egosi ọrụ gị ma kọwaa ihe iji chee na e kwesịrị ka e wee gị n'ọrụ ndị Global Voices gaa bs@globalvoices.org. Biko gbalịa fenye aha gị nakwa “Finance & Admin Manager” n'ebe ndeba isiokwu. Oge nkwụsị igosi mmasị n'ọrụ bụ 11:59pm EST (GMT -4) on September 19, 2019. 

Anyị ga-aka nabata ndị na-esighị na mba North America na Western Europe, anyị na-agbakwa ndị so na-akwado ọrụ Global Voices ume ka ha sonye n'igosi mmasị n'ọrụ a.

Start the conversation

Authors, please log in »

Guidelines

  • All comments are reviewed by a moderator. Do not submit your comment more than once or it may be identified as spam.
  • Please treat others with respect. Comments containing hate speech, obscenity, and personal attacks will not be approved.